Linguistics-Scholarly Publications
Permanent URI for this collection
Browse
Browsing Linguistics-Scholarly Publications by Subject "aha ahịa, njirimara, ndokọ, asụsụ, arụsị"
Now showing 1 - 1 of 1
Results Per Page
Sort Options
- ItemOpen AccessNTỌSASỊ AHA AHỊA IGBO DỊ O SIRI METỤTA ASỤSỤ N’OBODO(Igede Igbo. Journal of Igbo Studies, 2017-03-01) Oyeka, C.N.Aha ahịa bụ aha ndị ahụ metụtara ahịa anọ ndị Igbo na-azụ. Ọ bụ site n’aha ahịa anọ ndị a – Eke, Orie (Oye), Afọ na Nkwọ - ka ndị Igbo ji agụ izu ha. Ndị Igbo na-esite n’aha ahịa anọ ndị a egosịpụta ebumnobi ha, site n’iji ha were gụọ ụmụ ha aha. Nkọwa a gosịpụtara na aha ahịa Igbo metụtara asụsụ Igbo nke so na njirimara ndị Igbo. Nchọpụta e nwere n’oge ugbua na-egosịpụta na ọtụtụ ndị Igbo, ọ kachasị ndị ntorobịa anaghị azazi aha ahịa Igbo. Ọrụ nchọcha a na-eleru anya n’aha ahịa Igbo, site n’igosịpụta ihe kpatara ndị Igbo ji agụ ya bụ aha ahịa, ndokọ aha ndị a, otu ha siri metụta nwoke na nwaanyị, mpụtara aha ndị a nye ndị Igbo na ihe kpatara na ndị ntorobịa ugbua ejighịzi aza aha ahịa ndị a. Odee gbara ọtụtụ ndị mmadụ ajụjụọnụ iji chọpụta ụfọdụ n’ime aha ndị a, mpụtara ha, na ụmara ndị ntorobịa n’ebe aha ndị a dị. Nchọpụta e mere gosịrị na ndị Igbo na-agụ ma ụmụ ha ndị nwoke ma ndị nwaanyị aha ahịa, dịka ụbọchị ahịa a mụrụ ha siri dị, mpụtara aha ahịa ndị a dịkwa omimi, ndị Igbo ji aha ahịa ndị a egosịpụta ọbụghị naanị ụbochị ahịa a murụ nwa kama oge a murụ nwa ahụ na nkwenye ha n’ebe arụsị ndị nwe ahịa nọga. Nchọpụta ọzọ e nwekwara gosịrị na ọ bụ ekpemekpe ụka Kraịst, nke so ọbịbịa ndị Ọcha n’ala Igbo mere ka ọtụtụ ndị Igbo tụfuo ihe gbasara aha ahịa dịka ihe hibere isi n’ikpere arụsị ma werezie ‘Chi’ mọọbụ ‘Chukwu’ dochie anya aha ndị ha nwere ike idochi. Ikwu ka ndị Igbo laghachi azụ ịgụ ụmụ ha aha ahịa ga-abụ ihe siri nnukwu ike n’omume. Mana edemede a dị mkpa n’ihi na idetu aha ahịa ndị a, mpụtara ha na uru ha baara ndị Igbo ga-enyere ndị na-etolite etolite aka,ọkachasị ndị ebighi n’ala Igbo, ịghọta nke ọma ihe gbasara asụsụ na nkwenye ndị Igbo, karịchaa dịka o siri metụta aha ahịa ha.